Mak 14:55
Mark 14:55 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndịisi nchụaja na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ukwu* nọ na-achọ ama megide Jisọs, ka ha nwee ike gbuo ya. Ma ọ dịghị nke ha chọtara.
Mark 14:55 in English
Mark 14:55 · Berean Standard Bible
Now the chief priests and the whole Sanhedrin * were seeking testimony against Jesus to put Him to death, but they did not find any.
Context
53Ha duuru Jisọs gakwuru onyeisi nchụaja, ha niile bụ ndịisi nchụaja, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ nʼebe ahụ. 54Pita sooro ha, ma ọ nọ nʼebe dị anya. O sooro ha bata nʼobi onyeisi nchụaja. Nʼebe ahụ, o sooro ndị nche nọdụ ọdụ na-anya ọkụ. 55Ndịisi nchụaja na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ukwu* nọ na-achọ ama megide Jisọs, ka ha nwee ike gbuo ya. Ma ọ dịghị nke ha chọtara. 56Ọtụtụ bịara gbaa ama ụgha megide ya, ma ama ha abụghị otu. 57Mgbe ahụ ụfọdụ biliri gbaa ama ụgha megide ya, sị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.