Mak 14:53
Mark 14:53 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha duuru Jisọs gakwuru onyeisi nchụaja, ha niile bụ ndịisi nchụaja, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ nʼebe ahụ.
Mark 14:53 in English
Mark 14:53 · Berean Standard Bible
They led Jesus away to the high priest, and all the chief priests, elders, and scribes assembled.
Context
51Ọ dị otu nwokorobịa na-eso ya, ọ ji naanị akwa ọcha linin kpuchie onwe ya. Mgbe ha jidere ya, 52ọ hapụụrụ ha akwa ọcha linin ya, gbara ọtọ gbalaga. 53Ha duuru Jisọs gakwuru onyeisi nchụaja, ha niile bụ ndịisi nchụaja, na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ nʼebe ahụ. 54Pita sooro ha, ma ọ nọ nʼebe dị anya. O sooro ha bata nʼobi onyeisi nchụaja. Nʼebe ahụ, o sooro ndị nche nọdụ ọdụ na-anya ọkụ. 55Ndịisi nchụaja na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ukwu* nọ na-achọ ama megide Jisọs, ka ha nwee ike gbuo ya. Ma ọ dịghị nke ha chọtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.