Maika 6:9
Micah 6:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gee ntị! Olu Onyenwe anyị na-ada na-akpọku ndị obodo ahụ, nʼezie, ịtụ egwu gị bụ inwe amamihe. “Nụrụnụ olu mkpanaka na Onye hiwere ya.
Micah 6:9 in English
Micah 6:9 · Berean Standard Bible
The voice of the LORD calls out to the city (and it is sound wisdom to fear Your name): “Heed the rod and the One who ordained it.
Context
7Ọ ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, bụ ọtụtụ puku ebule,
ya na iri puku mmanụ na-asọ dịka iyi?
Aga m eji nwa mbụ m chụọ aja njehie m,
maọbụ mkpụrụ nke ahụ m chụọ aja maka mmehie nke mkpụrụobi m? 8Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma.
Gịnịkwa bụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-achọ nʼaka gị,
Ọ bụ na ọ bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya,
na iji obi dị umeala soro Chineke gị na-eje ije? 9Gee ntị! Olu Onyenwe anyị na-ada na-akpọku ndị obodo ahụ,
nʼezie, ịtụ egwu gị bụ inwe amamihe.
“Nụrụnụ olu mkpanaka na Onye hiwere ya. 10Ọ ga-abụ na m ga-echezọ akụ ị kpara nʼụzọ na-ezighị ezi, gị ụlọ ajọ omume,
ya na ihe ọtụtụ nke na-erughị eru unu ji ere ahịa, bụ nke abụrụ ọnụ? 11M ga-asị onye na-eji ihe ọtụtụ aghụghọ azụ ahịa,
na onye bu akpa nke ihe ọtụtụ aghụghọ dị iche iche juru nʼime ya na aka ya dị ọcha?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.