Maika 6:7
Micah 6:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, bụ ọtụtụ puku ebule, ya na iri puku mmanụ na-asọ dịka iyi? Aga m eji nwa mbụ m chụọ aja njehie m, maọbụ mkpụrụ nke ahụ m chụọ aja maka mmehie nke mkpụrụobi m?
Micah 6:7 in English
Micah 6:7 · Berean Standard Bible
Would the LORD be pleased with thousands of rams, with ten thousand rivers of oil? Shall I present my firstborn for my transgression, the fruit of my body for the sin of my soul?
Context
5Ndị m, chetanụ
ihe Balak eze Moab zubere
na ihe Belam nwa Beoa zara ya.
Chetanụ njem unu site nʼobodo Shitim ruo obodo Gilgal,
ka unu hụ nzọpụta nke Onyenwe anyị.” 6Gịnị ka m ga-eji bịa nʼihu Onyenwe anyị,
ịkpọ isiala nʼihu Chineke onye dị oke elu?
M ga-eji onyinye aja nsure ọkụ bịa nʼihu ya
nke e ji ụmụ ehi gbara otu afọ chụọ? 7Ọ ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, bụ ọtụtụ puku ebule,
ya na iri puku mmanụ na-asọ dịka iyi?
Aga m eji nwa mbụ m chụọ aja njehie m,
maọbụ mkpụrụ nke ahụ m chụọ aja maka mmehie nke mkpụrụobi m? 8Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma.
Gịnịkwa bụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-achọ nʼaka gị,
Ọ bụ na ọ bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya,
na iji obi dị umeala soro Chineke gị na-eje ije? 9Gee ntị! Olu Onyenwe anyị na-ada na-akpọku ndị obodo ahụ,
nʼezie, ịtụ egwu gị bụ inwe amamihe.
“Nụrụnụ olu mkpanaka na Onye hiwere ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.