Maika 6:8
Micah 6:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma. Gịnịkwa bụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-achọ nʼaka gị, Ọ bụ na ọ bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya, na iji obi dị umeala soro Chineke gị na-eje ije?
Micah 6:8 in English
Micah 6:8 · Berean Standard Bible
He has shown you, O man, what is good. And what does the LORD require of you but to act justly, to love mercy, and to walk humbly with your God?
Context
6Gịnị ka m ga-eji bịa nʼihu Onyenwe anyị,
ịkpọ isiala nʼihu Chineke onye dị oke elu?
M ga-eji onyinye aja nsure ọkụ bịa nʼihu ya
nke e ji ụmụ ehi gbara otu afọ chụọ? 7Ọ ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, bụ ọtụtụ puku ebule,
ya na iri puku mmanụ na-asọ dịka iyi?
Aga m eji nwa mbụ m chụọ aja njehie m,
maọbụ mkpụrụ nke ahụ m chụọ aja maka mmehie nke mkpụrụobi m? 8Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma.
Gịnịkwa bụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-achọ nʼaka gị,
Ọ bụ na ọ bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya,
na iji obi dị umeala soro Chineke gị na-eje ije? 9Gee ntị! Olu Onyenwe anyị na-ada na-akpọku ndị obodo ahụ,
nʼezie, ịtụ egwu gị bụ inwe amamihe.
“Nụrụnụ olu mkpanaka na Onye hiwere ya. 10Ọ ga-abụ na m ga-echezọ akụ ị kpara nʼụzọ na-ezighị ezi, gị ụlọ ajọ omume,
ya na ihe ọtụtụ nke na-erughị eru unu ji ere ahịa, bụ nke abụrụ ọnụ?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.