Native Bible

Micah 6:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị m, chetanụ ihe Balak eze Moab zubere na ihe Belam nwa Beoa zara ya. Chetanụ njem unu site nʼobodo Shitim ruo obodo Gilgal, ka unu hụ nzọpụta nke Onyenwe anyị.”

Micah 6:5 in English

Micah 6:5 · Berean Standard Bible

My people, remember what Balak king of Moab counseled and what Balaam son of Beor answered. Remember your journey from Shittim * to Gilgal, so that you may acknowledge the righteousness of the LORD.’”

Context

3“Unu bụ ndị m, gịnị ka m mere unu? Gwanụ m ụzọ m si boo unu ibu arọ? Zaanụ m. 4Nʼihi na e si m nʼala Ijipt kpọpụta unu. Agbapụtara m unu site na ịbụ ohu, nye unu Mosis na Erọn na Miriam ka ha nyere unu aka. 5Ndị m, chetanụ ihe Balak eze Moab zubere na ihe Belam nwa Beoa zara ya. Chetanụ njem unu site nʼobodo Shitim ruo obodo Gilgal, ka unu hụ nzọpụta nke Onyenwe anyị.” 6Gịnị ka m ga-eji bịa nʼihu Onyenwe anyị, ịkpọ isiala nʼihu Chineke onye dị oke elu? M ga-eji onyinye aja nsure ọkụ bịa nʼihu ya nke e ji ụmụ ehi gbara otu afọ chụọ? 7Ọ ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, bụ ọtụtụ puku ebule, ya na iri puku mmanụ na-asọ dịka iyi? Aga m eji nwa mbụ m chụọ aja njehie m, maọbụ mkpụrụ nke ahụ m chụọ aja maka mmehie nke mkpụrụobi m?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.