Maika 6:3
Micah 6:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Unu bụ ndị m, gịnị ka m mere unu? Gwanụ m ụzọ m si boo unu ibu arọ? Zaanụ m.
Micah 6:3 in English
Micah 6:3 · Berean Standard Bible
‘My people, what have I done to you? Testify against Me how I have wearied you!
Context
1Geenụ ntị nʼihe Onyenwe anyị na-ekwu,
“Bilienụ ọtọ, ma kwuonụ nʼihu ugwu niile ụzọ m siri mejọọ unu.
Ka ugwu nta niile nụkwa ihe i nwere ikwu. 2“Ma ugbu a geenụ ntị, unu ugwu niile,
geenụ ntị, unu ntọala ebighị ebi niile nke ụwa,
nʼihi na Onyenwe anyị nwere ikpe megide ndị nke ya.
Ọ bụkwa Izrel ka ọ ga-arụso ụka. 3“Unu bụ ndị m, gịnị ka m mere unu?
Gwanụ m ụzọ m si boo unu ibu arọ? Zaanụ m. 4Nʼihi na e si m nʼala Ijipt kpọpụta unu.
Agbapụtara m unu site na ịbụ ohu,
nye unu Mosis
na Erọn na Miriam ka ha nyere unu aka. 5Ndị m, chetanụ
ihe Balak eze Moab zubere
na ihe Belam nwa Beoa zara ya.
Chetanụ njem unu site nʼobodo Shitim ruo obodo Gilgal,
ka unu hụ nzọpụta nke Onyenwe anyị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.