Native Bible

Micah 6:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Geenụ ntị nʼihe Onyenwe anyị na-ekwu, “Bilienụ ọtọ, ma kwuonụ nʼihu ugwu niile ụzọ m siri mejọọ unu. Ka ugwu nta niile nụkwa ihe i nwere ikwu.

Micah 6:1 in English

Micah 6:1 · Berean Standard Bible

Hear now what the LORD says: “Arise, plead your case before the mountains, and let the hills hear your voice.

Context

1Geenụ ntị nʼihe Onyenwe anyị na-ekwu, “Bilienụ ọtọ, ma kwuonụ nʼihu ugwu niile ụzọ m siri mejọọ unu. Ka ugwu nta niile nụkwa ihe i nwere ikwu. 2“Ma ugbu a geenụ ntị, unu ugwu niile, geenụ ntị, unu ntọala ebighị ebi niile nke ụwa, nʼihi na Onyenwe anyị nwere ikpe megide ndị nke ya. Ọ bụkwa Izrel ka ọ ga-arụso ụka. 3“Unu bụ ndị m, gịnị ka m mere unu? Gwanụ m ụzọ m si boo unu ibu arọ? Zaanụ m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.