Native Bible

Micah 6:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

M ga-asị onye na-eji ihe ọtụtụ aghụghọ azụ ahịa, na onye bu akpa nke ihe ọtụtụ aghụghọ dị iche iche juru nʼime ya na aka ya dị ọcha?

Micah 6:11 in English

Micah 6:11 · Berean Standard Bible

Can I excuse dishonest scales or bags of false weights?

Context

9Gee ntị! Olu Onyenwe anyị na-ada na-akpọku ndị obodo ahụ, nʼezie, ịtụ egwu gị bụ inwe amamihe. “Nụrụnụ olu mkpanaka na Onye hiwere ya. 10Ọ ga-abụ na m ga-echezọ akụ ị kpara nʼụzọ na-ezighị ezi, gị ụlọ ajọ omume, ya na ihe ọtụtụ nke na-erughị eru unu ji ere ahịa, bụ nke abụrụ ọnụ? 11M ga-asị onye na-eji ihe ọtụtụ aghụghọ azụ ahịa, na onye bu akpa nke ihe ọtụtụ aghụghọ dị iche iche juru nʼime ya na aka ya dị ọcha? 12Ndị ọgaranya unu bụ ndị na-eme ihe ike, ndị mmadụ nọ nʼime gị na-agha ụgha, ire ha na-ekwu naanị okwu aghụghọ. 13Nʼihi ya, ebidola m ịla unu nʼiyi, na ime ka unu bụrụ ndị e bibiri nʼihi mmehie unu

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.