Maika 6:12
Micah 6:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ọgaranya unu bụ ndị na-eme ihe ike, ndị mmadụ nọ nʼime gị na-agha ụgha, ire ha na-ekwu naanị okwu aghụghọ.
Micah 6:12 in English
Micah 6:12 · Berean Standard Bible
For the wealthy of the city are full of violence, and its residents speak lies; their tongues are deceitful in their mouths.
Context
10Ọ ga-abụ na m ga-echezọ akụ ị kpara nʼụzọ na-ezighị ezi, gị ụlọ ajọ omume,
ya na ihe ọtụtụ nke na-erughị eru unu ji ere ahịa, bụ nke abụrụ ọnụ? 11M ga-asị onye na-eji ihe ọtụtụ aghụghọ azụ ahịa,
na onye bu akpa nke ihe ọtụtụ aghụghọ dị iche iche juru nʼime ya na aka ya dị ọcha? 12Ndị ọgaranya unu bụ ndị na-eme ihe ike,
ndị mmadụ nọ nʼime gị na-agha ụgha,
ire ha na-ekwu naanị okwu aghụghọ. 13Nʼihi ya, ebidola m ịla unu nʼiyi,
na ime ka unu bụrụ ndị e bibiri nʼihi mmehie unu 14Unu ga-eri nri ma afọ agaghị eju unu;
afọ agaghị ejukwa unu eju.
Unu ga-ewezuga ihe, ma unu agaghị echekwa ha,
nʼihi na ihe ọbụla unu nwere ike chekwaa, ka m ga-ewere nyefee nʼaka mma agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.