Native Bible

Micah 6:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu ga-eri nri ma afọ agaghị eju unu; afọ agaghị ejukwa unu eju. Unu ga-ewezuga ihe, ma unu agaghị echekwa ha, nʼihi na ihe ọbụla unu nwere ike chekwaa, ka m ga-ewere nyefee nʼaka mma agha.

Micah 6:14 in English

Micah 6:14 · Berean Standard Bible

You will eat but not be satisfied, and your hunger will remain with you. What you acquire, you will not preserve; and what you save, I will give to the sword.

Context

12Ndị ọgaranya unu bụ ndị na-eme ihe ike, ndị mmadụ nọ nʼime gị na-agha ụgha, ire ha na-ekwu naanị okwu aghụghọ. 13Nʼihi ya, ebidola m ịla unu nʼiyi, na ime ka unu bụrụ ndị e bibiri nʼihi mmehie unu 14Unu ga-eri nri ma afọ agaghị eju unu; afọ agaghị ejukwa unu eju. Unu ga-ewezuga ihe, ma unu agaghị echekwa ha, nʼihi na ihe ọbụla unu nwere ike chekwaa, ka m ga-ewere nyefee nʼaka mma agha. 15Unu ga-akụ mkpụrụ, ma unu agaghị ewe ihe ubi, unu ga-azọchapụta mmanụ oliv, ma unu agaghị ete ya nʼahụ unu; unu ga-azọchapụtakwa mmanya site na mkpụrụ vaịnị, ma unu agaghị aṅụ mmanya ya. 16Unu edebela ụkpụrụ niile bụ nke Omri, na omenaala niile nke ụlọ Ehab, unu gbasokwara ndụmọdụ ha niile. Nʼihi ya, aga m enyefe unu nʼaka mbibi mee ka ndị gị ghọọkwa ihe ọchị, unu ga-aghọkwara mba niile ihe nkọcha.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.