Maika 6:16
Micah 6:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu edebela ụkpụrụ niile bụ nke Omri, na omenaala niile nke ụlọ Ehab, unu gbasokwara ndụmọdụ ha niile. Nʼihi ya, aga m enyefe unu nʼaka mbibi mee ka ndị gị ghọọkwa ihe ọchị, unu ga-aghọkwara mba niile ihe nkọcha.”
Micah 6:16 in English
Micah 6:16 · Berean Standard Bible
You have kept the statutes of Omri and all the practices of Ahab’s house; you have followed their counsel. Therefore I will make you a desolation, and your inhabitants an object of contempt; you will bear the scorn of the nations.*”
Context
14Unu ga-eri nri ma afọ agaghị eju unu;
afọ agaghị ejukwa unu eju.
Unu ga-ewezuga ihe, ma unu agaghị echekwa ha,
nʼihi na ihe ọbụla unu nwere ike chekwaa, ka m ga-ewere nyefee nʼaka mma agha. 15Unu ga-akụ mkpụrụ, ma unu agaghị ewe ihe ubi,
unu ga-azọchapụta mmanụ oliv, ma unu agaghị ete ya nʼahụ unu;
unu ga-azọchapụtakwa mmanya site na mkpụrụ vaịnị, ma unu agaghị aṅụ mmanya ya. 16Unu edebela ụkpụrụ niile bụ nke Omri,
na omenaala niile nke ụlọ Ehab,
unu gbasokwara ndụmọdụ ha niile.
Nʼihi ya, aga m enyefe unu nʼaka mbibi
mee ka ndị gị ghọọkwa ihe ọchị,
unu ga-aghọkwara mba niile ihe nkọcha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.