Native Bible

Micah 2:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Bilienụ, pụọnụ, nʼihi na ebe a abụkwaghị ebe izuike, nʼihi na-emerụọla ya, e bibiela ya, o bibikwaala, ruo na-ịrụzi ya agaghị adị ire.

Micah 2:10 in English

Micah 2:10 · Berean Standard Bible

Arise and depart, for this is not your place of rest, because its defilement brings destruction— a grievous destruction!

Context

8Ma ọ bụ unu na-ebili megide ndị m dịka ndị iro. Unu na-eyipụ ndị na-agafe agafe uwe ọma ha yi nʼahụ ha na-enweghị mmetụta, dịka a ga-asị na unu bụ ndị si nʼagha na-alọta. 9Unu na-achụpụ ndị inyom ndị m site nʼụlọ afọ ojuju ha. Ụmụ ha ka unu na-anapụ ngọzị m ruo mgbe ebighị ebi. 10Bilienụ, pụọnụ, nʼihi na ebe a abụkwaghị ebe izuike, nʼihi na-emerụọla ya, e bibiela ya, o bibikwaala, ruo na-ịrụzi ya agaghị adị ire. 11Ọ bụrụ na otu onye abịa buoro unu amụma ụgha na-asị, ‘Aga m eburu unu amụma banyere mmanya na ihe ọṅụṅụ siri ike,’ ọ bụ onye amụma dị otu a ka ndị a chọrọ. 12“Aga m achịkọta unu niile, gị Jekọb, aga m akpọkọta ndị niile fọdụrụ nʼIzrel nʼotu ebe. Aga m akpọkọta ha dịka atụrụ nʼime ọgba anụ, dịka igwe ewu na atụrụ nʼebe ịta nri ya, ndị mmadụ ga-ejupụtakwa nʼebe ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.