Maika 2:10
Micah 2:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Bilienụ, pụọnụ, nʼihi na ebe a abụkwaghị ebe izuike, nʼihi na-emerụọla ya, e bibiela ya, o bibikwaala, ruo na-ịrụzi ya agaghị adị ire.
Micah 2:10 in English
Micah 2:10 · Berean Standard Bible
Arise and depart, for this is not your place of rest, because its defilement brings destruction— a grievous destruction!
Context
8Ma ọ bụ unu na-ebili megide ndị m
dịka ndị iro.
Unu na-eyipụ ndị na-agafe agafe
uwe ọma ha yi nʼahụ ha na-enweghị mmetụta,
dịka a ga-asị na unu bụ ndị si nʼagha na-alọta. 9Unu na-achụpụ ndị inyom ndị m
site nʼụlọ afọ ojuju ha.
Ụmụ ha ka unu na-anapụ ngọzị m
ruo mgbe ebighị ebi. 10Bilienụ, pụọnụ,
nʼihi na ebe a abụkwaghị ebe izuike,
nʼihi na-emerụọla ya, e bibiela ya,
o bibikwaala, ruo na-ịrụzi ya agaghị adị ire. 11Ọ bụrụ na otu onye abịa buoro unu amụma ụgha na-asị,
‘Aga m eburu unu amụma banyere mmanya na ihe ọṅụṅụ siri ike,’
ọ bụ onye amụma dị otu a ka ndị a chọrọ. 12“Aga m achịkọta unu niile, gị Jekọb,
aga m akpọkọta ndị niile fọdụrụ nʼIzrel nʼotu ebe.
Aga m akpọkọta ha dịka atụrụ nʼime ọgba anụ,
dịka igwe ewu na atụrụ nʼebe ịta nri ya,
ndị mmadụ ga-ejupụtakwa nʼebe ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.