Maika 2:11
Micah 2:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na otu onye abịa buoro unu amụma ụgha na-asị, ‘Aga m eburu unu amụma banyere mmanya na ihe ọṅụṅụ siri ike,’ ọ bụ onye amụma dị otu a ka ndị a chọrọ.
Micah 2:11 in English
Micah 2:11 · Berean Standard Bible
If a man of wind were to come and say falsely, “I will preach to you of wine and strong drink,”* he would be just the preacher for this people!
Context
9Unu na-achụpụ ndị inyom ndị m
site nʼụlọ afọ ojuju ha.
Ụmụ ha ka unu na-anapụ ngọzị m
ruo mgbe ebighị ebi. 10Bilienụ, pụọnụ,
nʼihi na ebe a abụkwaghị ebe izuike,
nʼihi na-emerụọla ya, e bibiela ya,
o bibikwaala, ruo na-ịrụzi ya agaghị adị ire. 11Ọ bụrụ na otu onye abịa buoro unu amụma ụgha na-asị,
‘Aga m eburu unu amụma banyere mmanya na ihe ọṅụṅụ siri ike,’
ọ bụ onye amụma dị otu a ka ndị a chọrọ. 12“Aga m achịkọta unu niile, gị Jekọb,
aga m akpọkọta ndị niile fọdụrụ nʼIzrel nʼotu ebe.
Aga m akpọkọta ha dịka atụrụ nʼime ọgba anụ,
dịka igwe ewu na atụrụ nʼebe ịta nri ya,
ndị mmadụ ga-ejupụtakwa nʼebe ahụ. 13Onye ahụ na-egbuwa ụzọ ga-anọ nʼihu na-edu ha.
Ha ga-etipukwa ọnụ ụzọ ama ahụ, ma site na ya gafee.
Eze ha ga-agabigakwa nʼihu ha,
Onyenwe anyị ga-anọ nʼisi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.