Maika 2:13
Micah 2:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ahụ na-egbuwa ụzọ ga-anọ nʼihu na-edu ha. Ha ga-etipukwa ọnụ ụzọ ama ahụ, ma site na ya gafee. Eze ha ga-agabigakwa nʼihu ha, Onyenwe anyị ga-anọ nʼisi.”
Micah 2:13 in English
Micah 2:13 · Berean Standard Bible
One who breaks open the way will go up before them; they will break through the gate, and go out by it. Their King will pass through before them, the LORD as their leader.
Context
11Ọ bụrụ na otu onye abịa buoro unu amụma ụgha na-asị,
‘Aga m eburu unu amụma banyere mmanya na ihe ọṅụṅụ siri ike,’
ọ bụ onye amụma dị otu a ka ndị a chọrọ. 12“Aga m achịkọta unu niile, gị Jekọb,
aga m akpọkọta ndị niile fọdụrụ nʼIzrel nʼotu ebe.
Aga m akpọkọta ha dịka atụrụ nʼime ọgba anụ,
dịka igwe ewu na atụrụ nʼebe ịta nri ya,
ndị mmadụ ga-ejupụtakwa nʼebe ahụ. 13Onye ahụ na-egbuwa ụzọ ga-anọ nʼihu na-edu ha.
Ha ga-etipukwa ọnụ ụzọ ama ahụ, ma site na ya gafee.
Eze ha ga-agabigakwa nʼihu ha,
Onyenwe anyị ga-anọ nʼisi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.