Native Bible

Micah 2:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ bụ unu na-ebili megide ndị m dịka ndị iro. Unu na-eyipụ ndị na-agafe agafe uwe ọma ha yi nʼahụ ha na-enweghị mmetụta, dịka a ga-asị na unu bụ ndị si nʼagha na-alọta.

Micah 2:8 in English

Micah 2:8 · Berean Standard Bible

But of late My people have risen up like an enemy: You strip off the splendid robe from unsuspecting passersby like men returning from battle.

Context

6Ndị amụma ha na-asị, “Unu ebukwala amụma.” “Unu ebukwala amụma banyere ihe ndị a, ihere agaghị eme anyị.” 7Ụdị ihe a o kwesiri okwukwu, gị ụlọ Jekọb? “Ntachiobi Onyenwe anyị ọ gwụla? Ihe ndị a ọ bụ otu o si eme?” “Ọ bụ na okwu m adịghị eme onye ụzọ ya ziri ezi mma? 8Ma ọ bụ unu na-ebili megide ndị m dịka ndị iro. Unu na-eyipụ ndị na-agafe agafe uwe ọma ha yi nʼahụ ha na-enweghị mmetụta, dịka a ga-asị na unu bụ ndị si nʼagha na-alọta. 9Unu na-achụpụ ndị inyom ndị m site nʼụlọ afọ ojuju ha. Ụmụ ha ka unu na-anapụ ngọzị m ruo mgbe ebighị ebi. 10Bilienụ, pụọnụ, nʼihi na ebe a abụkwaghị ebe izuike, nʼihi na-emerụọla ya, e bibiela ya, o bibikwaala, ruo na-ịrụzi ya agaghị adị ire.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.