Maika 2:7
Micah 2:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụdị ihe a o kwesiri okwukwu, gị ụlọ Jekọb? “Ntachiobi Onyenwe anyị ọ gwụla? Ihe ndị a ọ bụ otu o si eme?” “Ọ bụ na okwu m adịghị eme onye ụzọ ya ziri ezi mma?
Micah 2:7 in English
Micah 2:7 · Berean Standard Bible
Should it be said, O house of Jacob, “Is the Spirit of the LORD impatient? Are these the things He does?” Do not My words bring good to him who walks uprightly?
Context
5Nʼihi ya, ọ dịkwaghị onye ga-afọdụ nʼetiti ọgbakọ nke Onyenwe anyị,
onye ga-eji ihe ọtụtụ kee ala ahụ site nʼife nza. 6Ndị amụma ha na-asị, “Unu ebukwala amụma.”
“Unu ebukwala amụma banyere ihe ndị a,
ihere agaghị eme anyị.” 7Ụdị ihe a o kwesiri okwukwu, gị ụlọ Jekọb?
“Ntachiobi Onyenwe anyị ọ gwụla?
Ihe ndị a ọ bụ otu o si eme?”
“Ọ bụ na okwu m adịghị eme
onye ụzọ ya ziri ezi mma? 8Ma ọ bụ unu na-ebili megide ndị m
dịka ndị iro.
Unu na-eyipụ ndị na-agafe agafe
uwe ọma ha yi nʼahụ ha na-enweghị mmetụta,
dịka a ga-asị na unu bụ ndị si nʼagha na-alọta. 9Unu na-achụpụ ndị inyom ndị m
site nʼụlọ afọ ojuju ha.
Ụmụ ha ka unu na-anapụ ngọzị m
ruo mgbe ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.