Native Bible

Micah 2:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ya, ọ dịkwaghị onye ga-afọdụ nʼetiti ọgbakọ nke Onyenwe anyị, onye ga-eji ihe ọtụtụ kee ala ahụ site nʼife nza.

Micah 2:5 in English

Micah 2:5 · Berean Standard Bible

Therefore, you will have no one in the assembly of the LORD to divide the land by lot.

Context

3Nʼihi nke a, Onyenwe anyị na-asị, “Lee, ana m akwado ihe ọjọọ megide agbụrụ a, nke unu na-enweghị ike isite na ya wezuga onwe unu. Unu agaghị eji nganga na-ejegharịkwa, nʼihi na ọ ga-abụ oge ọjọọ. 4Nʼụbọchị ahụ ha ga-akọcha unu, ha ga-abụrụ unu abụ iru ụjụ iji ya kọchaa unu na-asị, ‘Anyị abụrụla ndị lara nʼiyi, e kesaala ihe nnweta nke ndị m, ọ napụla m ha. O werela ubi anyị nyefee ha nʼaka ndị ahụ meriri anyị nʼagha.’ ” 5Nʼihi ya, ọ dịkwaghị onye ga-afọdụ nʼetiti ọgbakọ nke Onyenwe anyị, onye ga-eji ihe ọtụtụ kee ala ahụ site nʼife nza. 6Ndị amụma ha na-asị, “Unu ebukwala amụma.” “Unu ebukwala amụma banyere ihe ndị a, ihere agaghị eme anyị.” 7Ụdị ihe a o kwesiri okwukwu, gị ụlọ Jekọb? “Ntachiobi Onyenwe anyị ọ gwụla? Ihe ndị a ọ bụ otu o si eme?” “Ọ bụ na okwu m adịghị eme onye ụzọ ya ziri ezi mma?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.