Maika 2:5
Micah 2:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, ọ dịkwaghị onye ga-afọdụ nʼetiti ọgbakọ nke Onyenwe anyị, onye ga-eji ihe ọtụtụ kee ala ahụ site nʼife nza.
Micah 2:5 in English
Micah 2:5 · Berean Standard Bible
Therefore, you will have no one in the assembly of the LORD to divide the land by lot.
Context
3Nʼihi nke a, Onyenwe anyị na-asị,
“Lee, ana m akwado ihe ọjọọ megide agbụrụ a,
nke unu na-enweghị ike isite na ya wezuga onwe unu.
Unu agaghị eji nganga na-ejegharịkwa,
nʼihi na ọ ga-abụ oge ọjọọ. 4Nʼụbọchị ahụ ha ga-akọcha unu,
ha ga-abụrụ unu abụ iru ụjụ iji ya kọchaa unu na-asị,
‘Anyị abụrụla ndị lara nʼiyi,
e kesaala ihe nnweta nke ndị m,
ọ napụla m ha.
O werela ubi anyị nyefee ha nʼaka ndị ahụ meriri anyị nʼagha.’ ” 5Nʼihi ya, ọ dịkwaghị onye ga-afọdụ nʼetiti ọgbakọ nke Onyenwe anyị,
onye ga-eji ihe ọtụtụ kee ala ahụ site nʼife nza. 6Ndị amụma ha na-asị, “Unu ebukwala amụma.”
“Unu ebukwala amụma banyere ihe ndị a,
ihere agaghị eme anyị.” 7Ụdị ihe a o kwesiri okwukwu, gị ụlọ Jekọb?
“Ntachiobi Onyenwe anyị ọ gwụla?
Ihe ndị a ọ bụ otu o si eme?”
“Ọ bụ na okwu m adịghị eme
onye ụzọ ya ziri ezi mma?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.