Maika 2:3
Micah 2:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nke a, Onyenwe anyị na-asị, “Lee, ana m akwado ihe ọjọọ megide agbụrụ a, nke unu na-enweghị ike isite na ya wezuga onwe unu. Unu agaghị eji nganga na-ejegharịkwa, nʼihi na ọ ga-abụ oge ọjọọ.
Micah 2:3 in English
Micah 2:3 · Berean Standard Bible
Therefore this is what the LORD says: “I am planning against this nation a disaster from which you cannot free your necks. Then you will not walk so proudly, for it will be a time of calamity.
Context
1Ahụhụ na-adịrị ndị na-eche ihe ọjọọ nʼobi ha,
na ndị niile na-edina nʼakwa ha na-eche ajọ echiche.
Mgbe chi bọrọ, ha na-arụzu ihe ha chepụtara,
nʼihi na ikike imezu ya dị nʼaka ha. 2Ha na-enwe anya ukwu nʼebe ubi ndị ọzọ dị, were ha nʼaka ike,
na ụlọ dị iche iche, ha ewere ha nʼike.
Ha na-ejikwa aka ike nara ndị mmadụ ụlọ ha,
ha na-ezunara ha ihe nketa ha. 3Nʼihi nke a, Onyenwe anyị na-asị,
“Lee, ana m akwado ihe ọjọọ megide agbụrụ a,
nke unu na-enweghị ike isite na ya wezuga onwe unu.
Unu agaghị eji nganga na-ejegharịkwa,
nʼihi na ọ ga-abụ oge ọjọọ. 4Nʼụbọchị ahụ ha ga-akọcha unu,
ha ga-abụrụ unu abụ iru ụjụ iji ya kọchaa unu na-asị,
‘Anyị abụrụla ndị lara nʼiyi,
e kesaala ihe nnweta nke ndị m,
ọ napụla m ha.
O werela ubi anyị nyefee ha nʼaka ndị ahụ meriri anyị nʼagha.’ ” 5Nʼihi ya, ọ dịkwaghị onye ga-afọdụ nʼetiti ọgbakọ nke Onyenwe anyị,
onye ga-eji ihe ọtụtụ kee ala ahụ site nʼife nza.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.