Maika 1:4
Micah 1:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugwu ukwu niile na-agbaze nʼokpuru ụkwụ ya, ndagwurugwu niile na-agbawa, dịka abụba dị nso nʼọkụ, dịka mmiri si nʼebe dị elu na-asọdata
Micah 1:4 in English
Micah 1:4 · Berean Standard Bible
The mountains will melt beneath Him, and the valleys will split apart, like wax before the fire, like water rushing down a slope.
Context
2Geenụ ntị, unu ndị mmadụ, unu niile,
gee ntị, gị ụwa na ndị niile bi nʼime ya
ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gbaa akaebe megide unu,
bụ Onyenwe anyị site nʼụlọnsọ ukwu ya. 3Lee! Onyenwe anyị na-abịa! O si nʼebe obibi ya na-abịa.
Ọ na-abịa ma na-azọda ebe niile dị elu nke ụwa. 4Ugwu ukwu niile na-agbaze nʼokpuru ụkwụ ya,
ndagwurugwu niile na-agbawa,
dịka abụba dị nso nʼọkụ,
dịka mmiri si nʼebe dị elu na-asọdata 5Ihe ndị a bụ nʼihi njehie Jekọb,
nʼihi mmehie niile nke ndị Izrel.
Gịnị bụ njehie Jekọb?
Ọ bụghị Sameria?
Gịnịkwa bụ ebe dị elu nke Juda?
Ọ bụghị Jerusalem? 6“Nʼihi ya, aga m eme ka Sameria ghọọ mkpọmkpọ ebe,
ebe a na-akụ osisi vaịnị.*
Aga m awụnye nkume ya nʼime ndagwurugwu,
mekwaa ka ntọala ya pụta ihe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.