Maika 1:6
Micah 1:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi ya, aga m eme ka Sameria ghọọ mkpọmkpọ ebe, ebe a na-akụ osisi vaịnị.* Aga m awụnye nkume ya nʼime ndagwurugwu, mekwaa ka ntọala ya pụta ihe.
Micah 1:6 in English
Micah 1:6 · Berean Standard Bible
Therefore I will make Samaria a heap of rubble in the open field, a planting area for a vineyard. I will pour her stones into the valley and expose her foundations.
Context
4Ugwu ukwu niile na-agbaze nʼokpuru ụkwụ ya,
ndagwurugwu niile na-agbawa,
dịka abụba dị nso nʼọkụ,
dịka mmiri si nʼebe dị elu na-asọdata 5Ihe ndị a bụ nʼihi njehie Jekọb,
nʼihi mmehie niile nke ndị Izrel.
Gịnị bụ njehie Jekọb?
Ọ bụghị Sameria?
Gịnịkwa bụ ebe dị elu nke Juda?
Ọ bụghị Jerusalem? 6“Nʼihi ya, aga m eme ka Sameria ghọọ mkpọmkpọ ebe,
ebe a na-akụ osisi vaịnị.*
Aga m awụnye nkume ya nʼime ndagwurugwu,
mekwaa ka ntọala ya pụta ihe. 7Arụsị ha niile a pịrị apị ka a ga-akụjisi;
onyinye niile a na-ewebata nʼụlọ arụsị ha ka a ga-akpọ ọkụ.
Aga m ala arụsị niile ya a kpụrụ akpụ nʼiyi.
Ebe ọ bụ na e si nʼaka ndị na-agba akwụna na-ewebata onyinye ndị a,
a ga-eji ha kwụọ ụgwọ ịgba akwụna.” 8Nʼihi nke a, aga m akwa akwa, tikwaa mkpu akwa.
Aga m agbara ọtọ gbarakwa ụkwụ efu jegharịa.
Aga m akpọ mkpu dịka nkịta ọhịa,
tipụkwa ube akwa dịka ikwighịkwighị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.