Maika 1:8
Micah 1:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nke a, aga m akwa akwa, tikwaa mkpu akwa. Aga m agbara ọtọ gbarakwa ụkwụ efu jegharịa. Aga m akpọ mkpu dịka nkịta ọhịa, tipụkwa ube akwa dịka ikwighịkwighị.
Micah 1:8 in English
Micah 1:8 · Berean Standard Bible
Because of this I will lament and wail; I will walk barefoot and naked. I will howl like a jackal * and mourn like an ostrich.*
Context
6“Nʼihi ya, aga m eme ka Sameria ghọọ mkpọmkpọ ebe,
ebe a na-akụ osisi vaịnị.*
Aga m awụnye nkume ya nʼime ndagwurugwu,
mekwaa ka ntọala ya pụta ihe. 7Arụsị ha niile a pịrị apị ka a ga-akụjisi;
onyinye niile a na-ewebata nʼụlọ arụsị ha ka a ga-akpọ ọkụ.
Aga m ala arụsị niile ya a kpụrụ akpụ nʼiyi.
Ebe ọ bụ na e si nʼaka ndị na-agba akwụna na-ewebata onyinye ndị a,
a ga-eji ha kwụọ ụgwọ ịgba akwụna.” 8Nʼihi nke a, aga m akwa akwa, tikwaa mkpu akwa.
Aga m agbara ọtọ gbarakwa ụkwụ efu jegharịa.
Aga m akpọ mkpu dịka nkịta ọhịa,
tipụkwa ube akwa dịka ikwighịkwighị. 9Nʼihi na ọnya ya enweghị ngwọta,
o rutela na Juda.
O rutelarị ma nʼọnụ ụzọ ama nke ndị m,
rukwaarị Jerusalem. 10Unu ekwutela okwu ya na Gat;
unu akwakwala akwa ọbụla.
Tụrụọnụ onwe unu nʼuzuzu,
unu ndị Bet-Ofra.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.