Maika 1:7
Micah 1:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Arụsị ha niile a pịrị apị ka a ga-akụjisi; onyinye niile a na-ewebata nʼụlọ arụsị ha ka a ga-akpọ ọkụ. Aga m ala arụsị niile ya a kpụrụ akpụ nʼiyi. Ebe ọ bụ na e si nʼaka ndị na-agba akwụna na-ewebata onyinye ndị a, a ga-eji ha kwụọ ụgwọ ịgba akwụna.”
Micah 1:7 in English
Micah 1:7 · Berean Standard Bible
All her carved images will be smashed to pieces; all her wages will be burned in the fire, and I will destroy all her idols. Since she collected the wages of a prostitute, they will be used again on a prostitute.
Context
5Ihe ndị a bụ nʼihi njehie Jekọb,
nʼihi mmehie niile nke ndị Izrel.
Gịnị bụ njehie Jekọb?
Ọ bụghị Sameria?
Gịnịkwa bụ ebe dị elu nke Juda?
Ọ bụghị Jerusalem? 6“Nʼihi ya, aga m eme ka Sameria ghọọ mkpọmkpọ ebe,
ebe a na-akụ osisi vaịnị.*
Aga m awụnye nkume ya nʼime ndagwurugwu,
mekwaa ka ntọala ya pụta ihe. 7Arụsị ha niile a pịrị apị ka a ga-akụjisi;
onyinye niile a na-ewebata nʼụlọ arụsị ha ka a ga-akpọ ọkụ.
Aga m ala arụsị niile ya a kpụrụ akpụ nʼiyi.
Ebe ọ bụ na e si nʼaka ndị na-agba akwụna na-ewebata onyinye ndị a,
a ga-eji ha kwụọ ụgwọ ịgba akwụna.” 8Nʼihi nke a, aga m akwa akwa, tikwaa mkpu akwa.
Aga m agbara ọtọ gbarakwa ụkwụ efu jegharịa.
Aga m akpọ mkpu dịka nkịta ọhịa,
tipụkwa ube akwa dịka ikwighịkwighị. 9Nʼihi na ọnya ya enweghị ngwọta,
o rutela na Juda.
O rutelarị ma nʼọnụ ụzọ ama nke ndị m,
rukwaarị Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.