Maika 1:2
Micah 1:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Geenụ ntị, unu ndị mmadụ, unu niile, gee ntị, gị ụwa na ndị niile bi nʼime ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gbaa akaebe megide unu, bụ Onyenwe anyị site nʼụlọnsọ ukwu ya.
Micah 1:2 in English
Micah 1:2 · Berean Standard Bible
Hear, O peoples, all of you; listen, O earth, and everyone in it! May the Lord GOD bear witness against you, the Lord from His holy temple.
Context
1Nke a bụ okwu Onyenwe anyị nke bịaara Maịka, onye Moreshet, nʼoge eze Jotam, Ehaz na Hezekaya, bụ ndị eze Juda. Ọhụ nke ọ hụrụ banyere Sameria na Jerusalem. 2Geenụ ntị, unu ndị mmadụ, unu niile,
gee ntị, gị ụwa na ndị niile bi nʼime ya
ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gbaa akaebe megide unu,
bụ Onyenwe anyị site nʼụlọnsọ ukwu ya. 3Lee! Onyenwe anyị na-abịa! O si nʼebe obibi ya na-abịa.
Ọ na-abịa ma na-azọda ebe niile dị elu nke ụwa. 4Ugwu ukwu niile na-agbaze nʼokpuru ụkwụ ya,
ndagwurugwu niile na-agbawa,
dịka abụba dị nso nʼọkụ,
dịka mmiri si nʼebe dị elu na-asọdata
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.