Native Bible

Micah 1:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lee! Onyenwe anyị na-abịa! O si nʼebe obibi ya na-abịa. Ọ na-abịa ma na-azọda ebe niile dị elu nke ụwa.

Micah 1:3 in English

Micah 1:3 · Berean Standard Bible

For behold, the LORD comes forth from His dwelling place; He will come down and tread on the high places of the earth.

Context

1Nke a bụ okwu Onyenwe anyị nke bịaara Maịka, onye Moreshet, nʼoge eze Jotam, Ehaz na Hezekaya, bụ ndị eze Juda. Ọhụ nke ọ hụrụ banyere Sameria na Jerusalem. 2Geenụ ntị, unu ndị mmadụ, unu niile, gee ntị, gị ụwa na ndị niile bi nʼime ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gbaa akaebe megide unu, bụ Onyenwe anyị site nʼụlọnsọ ukwu ya. 3Lee! Onyenwe anyị na-abịa! O si nʼebe obibi ya na-abịa. Ọ na-abịa ma na-azọda ebe niile dị elu nke ụwa. 4Ugwu ukwu niile na-agbaze nʼokpuru ụkwụ ya, ndagwurugwu niile na-agbawa, dịka abụba dị nso nʼọkụ, dịka mmiri si nʼebe dị elu na-asọdata 5Ihe ndị a bụ nʼihi njehie Jekọb, nʼihi mmehie niile nke ndị Izrel. Gịnị bụ njehie Jekọb? Ọ bụghị Sameria? Gịnịkwa bụ ebe dị elu nke Juda? Ọ bụghị Jerusalem?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.