Maika 1:13
Micah 1:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ndị bi na Lakish kegidenụ ịnyịnya unu na-agba ọsọ nʼụgbọ agha. Ọ bụ nʼebe ahụ ka mmehie nwaada Zayọn malitere, nʼihi na mmehie Izrel na-eme ka a hụrụ nʼetiti unu.
Micah 1:13 in English
Micah 1:13 · Berean Standard Bible
Harness your chariot horses, O dweller of Lachish.* You were the beginning of sin to the Daughter of Zion, for the transgressions of Israel were found in you.
Context
11Gabiganụ nʼụzọ unu,
unu ndị bi na Shafia.
Nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ihere unu,
unu ndị bi na Zaanan abịakwala nso.
Ndị Bet-Ezel na-eru ụjụ
nʼihi na e wezugala ndị na-eche unu nche. 12Ndị bi na Marot nọ nʼoke ahụ mgbu
na-eche ka ihe ọma bịa,
nʼihi na mbibi esitela nʼaka Onyenwe anyị bịa,
ruo nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem 13Unu ndị bi na Lakish
kegidenụ ịnyịnya unu na-agba ọsọ nʼụgbọ agha.
Ọ bụ nʼebe ahụ ka mmehie nwaada Zayọn malitere,
nʼihi na mmehie Izrel na-eme ka a hụrụ nʼetiti unu. 14Ya mere, unu ga-enye Moreshet dị na Gat onyinye
mgbe unu na-agbapụ ọsọ.
Ụlọ Akzib ga-emesịa ghọọ ụlọ aghụghọ
nye ndị eze Izrel. 15Aga m akpọbata onye ga-emeri unu
ndị bi na Maresha nʼagha.
Ndị a na-asọpụrụ nke Izrel
ga-agbabanye nʼAdulam.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.