Maika 1:11
Micah 1:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gabiganụ nʼụzọ unu, unu ndị bi na Shafia. Nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ihere unu, unu ndị bi na Zaanan abịakwala nso. Ndị Bet-Ezel na-eru ụjụ nʼihi na e wezugala ndị na-eche unu nche.
Micah 1:11 in English
Micah 1:11 · Berean Standard Bible
Depart in shameful nakedness, O dwellers of Shaphir.* The dwellers of Zaanan * will not come out. Beth-ezel * is in mourning; its support is taken from you.
Context
9Nʼihi na ọnya ya enweghị ngwọta,
o rutela na Juda.
O rutelarị ma nʼọnụ ụzọ ama nke ndị m,
rukwaarị Jerusalem. 10Unu ekwutela okwu ya na Gat;
unu akwakwala akwa ọbụla.
Tụrụọnụ onwe unu nʼuzuzu,
unu ndị Bet-Ofra.* 11Gabiganụ nʼụzọ unu,
unu ndị bi na Shafia.
Nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ihere unu,
unu ndị bi na Zaanan abịakwala nso.
Ndị Bet-Ezel na-eru ụjụ
nʼihi na e wezugala ndị na-eche unu nche. 12Ndị bi na Marot nọ nʼoke ahụ mgbu
na-eche ka ihe ọma bịa,
nʼihi na mbibi esitela nʼaka Onyenwe anyị bịa,
ruo nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem 13Unu ndị bi na Lakish
kegidenụ ịnyịnya unu na-agba ọsọ nʼụgbọ agha.
Ọ bụ nʼebe ahụ ka mmehie nwaada Zayọn malitere,
nʼihi na mmehie Izrel na-eme ka a hụrụ nʼetiti unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.