Maika 1:12
Micah 1:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị bi na Marot nọ nʼoke ahụ mgbu na-eche ka ihe ọma bịa, nʼihi na mbibi esitela nʼaka Onyenwe anyị bịa, ruo nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem
Micah 1:12 in English
Micah 1:12 · Berean Standard Bible
For the dwellers of Maroth * pined for good, but calamity came down from the LORD, even to the gate of Jerusalem.
Context
10Unu ekwutela okwu ya na Gat;
unu akwakwala akwa ọbụla.
Tụrụọnụ onwe unu nʼuzuzu,
unu ndị Bet-Ofra.* 11Gabiganụ nʼụzọ unu,
unu ndị bi na Shafia.
Nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ihere unu,
unu ndị bi na Zaanan abịakwala nso.
Ndị Bet-Ezel na-eru ụjụ
nʼihi na e wezugala ndị na-eche unu nche. 12Ndị bi na Marot nọ nʼoke ahụ mgbu
na-eche ka ihe ọma bịa,
nʼihi na mbibi esitela nʼaka Onyenwe anyị bịa,
ruo nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem 13Unu ndị bi na Lakish
kegidenụ ịnyịnya unu na-agba ọsọ nʼụgbọ agha.
Ọ bụ nʼebe ahụ ka mmehie nwaada Zayọn malitere,
nʼihi na mmehie Izrel na-eme ka a hụrụ nʼetiti unu. 14Ya mere, unu ga-enye Moreshet dị na Gat onyinye
mgbe unu na-agbapụ ọsọ.
Ụlọ Akzib ga-emesịa ghọọ ụlọ aghụghọ
nye ndị eze Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.