Maika 1:14
Micah 1:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, unu ga-enye Moreshet dị na Gat onyinye mgbe unu na-agbapụ ọsọ. Ụlọ Akzib ga-emesịa ghọọ ụlọ aghụghọ nye ndị eze Izrel.
Micah 1:14 in English
Micah 1:14 · Berean Standard Bible
Therefore, send farewell gifts * to Moresheth-gath;* the houses of Achzib * will prove deceptive to the kings of Israel.
Context
12Ndị bi na Marot nọ nʼoke ahụ mgbu
na-eche ka ihe ọma bịa,
nʼihi na mbibi esitela nʼaka Onyenwe anyị bịa,
ruo nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem 13Unu ndị bi na Lakish
kegidenụ ịnyịnya unu na-agba ọsọ nʼụgbọ agha.
Ọ bụ nʼebe ahụ ka mmehie nwaada Zayọn malitere,
nʼihi na mmehie Izrel na-eme ka a hụrụ nʼetiti unu. 14Ya mere, unu ga-enye Moreshet dị na Gat onyinye
mgbe unu na-agbapụ ọsọ.
Ụlọ Akzib ga-emesịa ghọọ ụlọ aghụghọ
nye ndị eze Izrel. 15Aga m akpọbata onye ga-emeri unu
ndị bi na Maresha nʼagha.
Ndị a na-asọpụrụ nke Izrel
ga-agbabanye nʼAdulam. 16Kpachaanụ isi unu nʼọnọdụ iru ụjụ
nʼihi ụmụntakịrị ndị ahụ ihe ha masịrị unu,
meenụ ka isi unu kwọchaa dịka isi udele,
nʼihi na a ga-achụpụ ha site nʼebe unu nọ gaa mba ọzọ.
1:6 Ya bụ, ubi vaịnị
1:10 Bet-Ofra Maọbụ, Bet-Leafra nke pụtara ụlọ uzuzu
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.