Matiu 7:3
Matthew 7:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị* nʼanya ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya?
Matthew 7:3 in English
Matthew 7:3 · Berean Standard Bible
Why do you look at the speck in your brother’s eye, but fail to notice the beam in your own eye?
Context
1“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. 2Nʼihi na a ga-ekpe unu ikpe dịka unu si kpee ndị ọzọ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu. 3“Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị* nʼanya ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya? 4Olee otu ị ga-esi gwa ya si, ‘Nwanna m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nʼanya,’ mgbe obodobo osisi dị gị nʼanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ. 5Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ tụpụ ntakịrị ahịhịa nke dị nwanna gị nʼanya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.