Matiu 7:2
Matthew 7:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na a ga-ekpe unu ikpe dịka unu si kpee ndị ọzọ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu.
Matthew 7:2 in English
Matthew 7:2 · Berean Standard Bible
For with the same judgment you pronounce, you will be judged; and with the measure you use, it will be measured to you.
Context
1“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. 2Nʼihi na a ga-ekpe unu ikpe dịka unu si kpee ndị ọzọ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu. 3“Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị* nʼanya ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya? 4Olee otu ị ga-esi gwa ya si, ‘Nwanna m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nʼanya,’ mgbe obodobo osisi dị gị nʼanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.