Matiu 26:69
Matthew 26:69 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ Pita nọdụrụ ala na mbara ezi nke obi ahụ. Otu nʼime ụmụ agbọghọ na-eje ozi bịakwutere ya, sị, “Ị bụkwanụ otu nʼime ndị na-eso ụzọ Jisọs onye Galili.”
Matthew 26:69 in English
Matthew 26:69 · Berean Standard Bible
Meanwhile, Peter was sitting out in the courtyard, and a servant girl came up to him. “You also were with Jesus the Galilean,” she said.
Context
67Mgbe ahụ, ha gbụsara ya ọnụ mmiri asọ nʼihu, tiekwa ya aka. Ndị ọzọ maara ya ụra, 68sị ya, “Buoro anyị amụma, gị, Kraịst. Onye tiri gị ihe?” 69Mgbe ahụ Pita nọdụrụ ala na mbara ezi nke obi ahụ. Otu nʼime ụmụ agbọghọ na-eje ozi bịakwutere ya, sị, “Ị bụkwanụ otu nʼime ndị na-eso ụzọ Jisọs onye Galili.” 70Ma ọ gọrọ nʼihu ha niile sị, “Amaghị m ihe ị na-ekwu.” 71Mgbe ọ pụrụ gaa nọdụ nʼọnụ ụzọ mbata, nwaagbọghọ ọzọ hụrụ ya, gwa ndị nọ nʼebe ahụ sị, “Nwoke a na Jisọs onye Nazaret nọkọrọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.