Matiu 26:71
Matthew 26:71 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọ pụrụ gaa nọdụ nʼọnụ ụzọ mbata, nwaagbọghọ ọzọ hụrụ ya, gwa ndị nọ nʼebe ahụ sị, “Nwoke a na Jisọs onye Nazaret nọkọrọ.”
Matthew 26:71 in English
Matthew 26:71 · Berean Standard Bible
When Peter had gone out to the gateway, another servant girl saw him and said to the people there, “This man was with Jesus of Nazareth.”
Context
69Mgbe ahụ Pita nọdụrụ ala na mbara ezi nke obi ahụ. Otu nʼime ụmụ agbọghọ na-eje ozi bịakwutere ya, sị, “Ị bụkwanụ otu nʼime ndị na-eso ụzọ Jisọs onye Galili.” 70Ma ọ gọrọ nʼihu ha niile sị, “Amaghị m ihe ị na-ekwu.” 71Mgbe ọ pụrụ gaa nọdụ nʼọnụ ụzọ mbata, nwaagbọghọ ọzọ hụrụ ya, gwa ndị nọ nʼebe ahụ sị, “Nwoke a na Jisọs onye Nazaret nọkọrọ.” 72Ọzọkwa, o weere ịṅụ iyi gọọ, “Amaghị m onye nwoke ahụ bụ.” 73Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo nʼebe ahụ bịakwutere Pita sị ya, “Nʼezie, ịbụ otu nʼime ha, nʼihi na asụsụ gị agbaala gị ama.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.