Matiu 13:16
Matthew 13:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ngọzị na-adịrị anya unu, nʼihi na ha na-ahụ ụzọ, na ntị unu nʼihi na ha na-anụkwa ihe.
Matthew 13:16 in English
Matthew 13:16 · Berean Standard Bible
But blessed are your eyes because they see, and your ears because they hear.
Context
14Nke a bụkwa imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị,
“ ‘Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla.
Unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla. 15Nʼihi na obi ndị nke a a maala abụba, dịkwa arọ,
ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe,
ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ.
Ma ọ bụghị otu a ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ,
jirikwa ntị ha nụ ihe,
sitekwa nʼobi ha nwe nghọta
ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’* 16Ma ngọzị na-adịrị anya unu, nʼihi na ha na-ahụ ụzọ, na ntị unu nʼihi na ha na-anụkwa ihe. 17Nʼezie agwa m unu, ọtụtụ ndị amụma na ndị ezi omume ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ, ma ha ahụghị ya, na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ya. 18“Ugbu nụrụnụ nkọwa ilu ọgha mkpụrụ ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.