Matiu 13:15
Matthew 13:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na obi ndị nke a a maala abụba, dịkwa arọ, ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe, ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ma ọ bụghị otu a ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jirikwa ntị ha nụ ihe, sitekwa nʼobi ha nwe nghọta ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’*
Matthew 13:15 in English
Matthew 13:15 · Berean Standard Bible
For this people’s heart has grown callous; they hardly hear with their ears, and they have closed their eyes. Otherwise they might see with their eyes, hear with their ears, understand with their hearts, and turn, and I would heal them.’*
Context
13Nke a bụ ihe mere m ji agwa ha okwu nʼilu:
“Nʼihi na ha na-ele anya, ma ha adịghị ahụ ụzọ,
ha na-ege ntị, ma ha adịghị anụ ihe maọbụ aghọta ya. 14Nke a bụkwa imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị,
“ ‘Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla.
Unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla. 15Nʼihi na obi ndị nke a a maala abụba, dịkwa arọ,
ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe,
ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ.
Ma ọ bụghị otu a ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ,
jirikwa ntị ha nụ ihe,
sitekwa nʼobi ha nwe nghọta
ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’* 16Ma ngọzị na-adịrị anya unu, nʼihi na ha na-ahụ ụzọ, na ntị unu nʼihi na ha na-anụkwa ihe. 17Nʼezie agwa m unu, ọtụtụ ndị amụma na ndị ezi omume ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ, ma ha ahụghị ya, na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.