Matiu 13:18
Matthew 13:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ugbu nụrụnụ nkọwa ilu ọgha mkpụrụ ahụ.
Matthew 13:18 in English
Matthew 13:18 · Berean Standard Bible
Consider, then, the parable of the sower:
Context
16Ma ngọzị na-adịrị anya unu, nʼihi na ha na-ahụ ụzọ, na ntị unu nʼihi na ha na-anụkwa ihe. 17Nʼezie agwa m unu, ọtụtụ ndị amụma na ndị ezi omume ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ, ma ha ahụghị ya, na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ya. 18“Ugbu nụrụnụ nkọwa ilu ọgha mkpụrụ ahụ. 19Mgbe onye ọbụla nụrụ oziọma nke alaeze ahụ, ma ọ ghọtaghị ya, ajọ onye ahụ na-abịa napụ ya ihe ahụ akụrụ nʼobi ya. Nke a bụ mkpụrụ ahụ nke dara nʼokporoụzọ. 20Mkpụrụ nke dara nʼala nkume nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, jirikwa oke ọṅụ nabata ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.