Luk 6:20
Luke 6:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O weliri anya lee ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Ngọzị na-adịrị unu bụ ndị ogbenye, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke unu.
Luke 6:20 in English
Luke 6:20 · Berean Standard Bible
Looking up at His disciples, Jesus said: “Blessed are you who are poor, for yours is the kingdom of God.
Context
18Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. 19Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile. 20O weliri anya lee ndị na-eso ụzọ ya, sị ha,
“Ngọzị na-adịrị unu bụ ndị ogbenye,
nʼihi na alaeze Chineke bụ nke unu. 21Ngọzị na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a,
nʼihi na afọ ga-eju unu.
Ngọzị na-adịrị unu ndị na-ebe akwa ugbu a,
nʼihi na unu ga-achị ọchị. 22Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị,
mgbe ha na-achụpụ unu, na-akparị unu,
na-ajụ aha unu,
nʼihi Nwa nke Mmadụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.