Luk 6:21
Luke 6:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ngọzị na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a, nʼihi na afọ ga-eju unu. Ngọzị na-adịrị unu ndị na-ebe akwa ugbu a, nʼihi na unu ga-achị ọchị.
Luke 6:21 in English
Luke 6:21 · Berean Standard Bible
Blessed are you who hunger now, for you will be filled. Blessed are you who weep now, for you will laugh.
Context
19Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile. 20O weliri anya lee ndị na-eso ụzọ ya, sị ha,
“Ngọzị na-adịrị unu bụ ndị ogbenye,
nʼihi na alaeze Chineke bụ nke unu. 21Ngọzị na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a,
nʼihi na afọ ga-eju unu.
Ngọzị na-adịrị unu ndị na-ebe akwa ugbu a,
nʼihi na unu ga-achị ọchị. 22Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị,
mgbe ha na-achụpụ unu, na-akparị unu,
na-ajụ aha unu,
nʼihi Nwa nke Mmadụ. 23“Ṅụrịanụ ọṅụ ma wuliekwanụ elu nʼihi ọṅụ nʼụbọchị ahụ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na otu a ka ndị nna nna ha mesoro ndị amụma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.