Luk 6:19
Luke 6:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile.
Luke 6:19 in English
Luke 6:19 · Berean Standard Bible
The entire crowd was trying to touch Him, because power was coming from Him and healing them all.
Context
17Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn. 18Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. 19Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile. 20O weliri anya lee ndị na-eso ụzọ ya, sị ha,
“Ngọzị na-adịrị unu bụ ndị ogbenye,
nʼihi na alaeze Chineke bụ nke unu. 21Ngọzị na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a,
nʼihi na afọ ga-eju unu.
Ngọzị na-adịrị unu ndị na-ebe akwa ugbu a,
nʼihi na unu ga-achị ọchị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.