Native Bible

Luke 23:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ma na-asị, “Ọ bụrụ na ị bụ eze ndị Juu, zọpụtanụ onwe gị.”

Luke 23:37 in English

Luke 23:37 · Berean Standard Bible

“If You are the King of the Jews,” they said, “save Yourself!”

Context

35Ndị mmadụ guzoro ebe ahụ na-ele anya, ka ndị ọchịchị ji ya na-eme ihe ọchị, na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ya zọpụtanụ onwe ya, ma ọ bụrụ na ọ bụ Kraịst nke Chineke, bụ Onye a họpụtara.” 36Ndị agha bịakwara chịa ya ọchị. Ha nyere ya mmanya gbara ụka,* 37ma na-asị, “Ọ bụrụ na ị bụ eze ndị Juu, zọpụtanụ onwe gị.” 38Ihe e dere nʼelu isi obe ahụ bụ: Onye a bụ Eze ndị Juu. 39Otu onye nʼime ndị ohi ahụ a kpọgidekwara nʼobe nʼebe ahụ kparịkwara ya sị, “Ọ bụghị gị bụ Kraịst? Zọpụtanụ onwe gị ma zọpụtakwa anyị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.