Levitikọs 25:43
Leviticus 25:43 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A gakwaghị emegbu ha nʼụzọ dị njọ.* Tụọnụ egwu Chineke unu.
Leviticus 25:43 in English
Leviticus 25:43 · Berean Standard Bible
You are not to rule over them harshly, but you shall fear your God.
Context
41Nʼafọ ahụ, ị ga-ahapụ ha na ụmụ ha ka ha laghachikwuru ndị ikwu ha, si otu a nwetaghachi ala ubi dị nʼezinaụlọ ha. 42Nʼihi na a kpọpụtara m ndị Izrel site nʼala Ijipt ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi. Ya mere, a gaghị ere ha mgbe ọbụla dịka ohu. 43A gakwaghị emegbu ha nʼụzọ dị njọ.* Tụọnụ egwu Chineke unu. 44“ ‘Ma unu nwere ike gbara ndị ohu nwoke maọbụ nwanyị site nʼetiti ndị mba ọzọ niile bi nʼakụkụ unu. Unu nwere ike site nʼebe ahụ zụta ndị ohu. 45Unu nwere ike ịzụ ndị ohu site nʼetiti ndị mbịarambịa bi nʼetiti unu, maọbụ site nʼetiti ndị agbụrụ ha a mụrụ nʼala Izrel. Ndị dị otu a ga-abụkwa ihe onwunwe unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.