Native Bible

Leviticus 25:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na a kpọpụtara m ndị Izrel site nʼala Ijipt ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi. Ya mere, a gaghị ere ha mgbe ọbụla dịka ohu.

Leviticus 25:42 in English

Leviticus 25:42 · Berean Standard Bible

Because the Israelites are My servants, whom I brought out of the land of Egypt, they are not to be sold as slaves.

Context

40Kama ị ga-emeso ya mmeso dịka ị ga-esi meso onye ọrụ e goro ego, maọbụ dịka onye ọbịa nọ nʼetiti unu. Ọ ga-ejere gị ozi tutu ruo afọ inwere onwe. 41Nʼafọ ahụ, ị ga-ahapụ ha na ụmụ ha ka ha laghachikwuru ndị ikwu ha, si otu a nwetaghachi ala ubi dị nʼezinaụlọ ha. 42Nʼihi na a kpọpụtara m ndị Izrel site nʼala Ijipt ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi. Ya mere, a gaghị ere ha mgbe ọbụla dịka ohu. 43A gakwaghị emegbu ha nʼụzọ dị njọ.* Tụọnụ egwu Chineke unu. 44“ ‘Ma unu nwere ike gbara ndị ohu nwoke maọbụ nwanyị site nʼetiti ndị mba ọzọ niile bi nʼakụkụ unu. Unu nwere ike site nʼebe ahụ zụta ndị ohu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.