Levitikọs 25:41
Leviticus 25:41 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼafọ ahụ, ị ga-ahapụ ha na ụmụ ha ka ha laghachikwuru ndị ikwu ha, si otu a nwetaghachi ala ubi dị nʼezinaụlọ ha.
Leviticus 25:41 in English
Leviticus 25:41 · Berean Standard Bible
Then he and his children are to be released, and he may return to his clan and to the property of his fathers.
Context
39“ ‘Ọ bụrụ na onye Izrel ọbụla adaa ogbenye, resi gị onwe ya, emela ka o jere gị ozi dịka onye ohu. 40Kama ị ga-emeso ya mmeso dịka ị ga-esi meso onye ọrụ e goro ego, maọbụ dịka onye ọbịa nọ nʼetiti unu. Ọ ga-ejere gị ozi tutu ruo afọ inwere onwe. 41Nʼafọ ahụ, ị ga-ahapụ ha na ụmụ ha ka ha laghachikwuru ndị ikwu ha, si otu a nwetaghachi ala ubi dị nʼezinaụlọ ha. 42Nʼihi na a kpọpụtara m ndị Izrel site nʼala Ijipt ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi. Ya mere, a gaghị ere ha mgbe ọbụla dịka ohu. 43A gakwaghị emegbu ha nʼụzọ dị njọ.* Tụọnụ egwu Chineke unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.