Native Bible

Leviticus 25:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ma unu nwere ike gbara ndị ohu nwoke maọbụ nwanyị site nʼetiti ndị mba ọzọ niile bi nʼakụkụ unu. Unu nwere ike site nʼebe ahụ zụta ndị ohu.

Leviticus 25:44 in English

Leviticus 25:44 · Berean Standard Bible

Your menservants and maidservants shall come from the nations around you, from whom you may purchase them.

Context

42Nʼihi na a kpọpụtara m ndị Izrel site nʼala Ijipt ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi. Ya mere, a gaghị ere ha mgbe ọbụla dịka ohu. 43A gakwaghị emegbu ha nʼụzọ dị njọ.* Tụọnụ egwu Chineke unu. 44“ ‘Ma unu nwere ike gbara ndị ohu nwoke maọbụ nwanyị site nʼetiti ndị mba ọzọ niile bi nʼakụkụ unu. Unu nwere ike site nʼebe ahụ zụta ndị ohu. 45Unu nwere ike ịzụ ndị ohu site nʼetiti ndị mbịarambịa bi nʼetiti unu, maọbụ site nʼetiti ndị agbụrụ ha a mụrụ nʼala Izrel. Ndị dị otu a ga-abụkwa ihe onwunwe unu. 46Unu nwere ike kenye ha ụmụ unu dịka ihe nketa, ma mee ha ndị ohu unu ụbọchị ndụ ha niile. Ma unu agaghị eji aka ike chịa onye Izrel ibe unu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.