Joshua 24:30
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, na Timnat Sera,* nʼime ala ugwu ugwu Ifrem, nʼakụkụ ugwu dị nʼala Gaash.
Joshua 24:30 in English
Joshua 24:30 · Berean Standard Bible
And they buried him in the land of his inheritance, at Timnath-serah * in the hill country of Ephraim, north of Mount Gaash.
Context
28Emesịa, Joshua zilara onye ọbụla, ka ha laa nʼihe nketa nke aka ha. 29Ọ dịghị anya, mgbe ihe ndị a gasịrị, Joshua nwa Nun, odibo Onyenwe anyị nwụrụ, mgbe ọ gbara narị afọ na iri. 30E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, na Timnat Sera,* nʼime ala ugwu ugwu Ifrem, nʼakụkụ ugwu dị nʼala Gaash. 31Ndị Izrel fere Onyenwe anyị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, ndị maakwara ihe niile nke Onyenwe anyị rụụrụ ndị Izrel. 32Ọkpụkpụ Josef ndị Izrel chịtara mgbe ha si nʼala Ijipt pụta, ka ha liri na Shekem, nʼime ala ahụ Jekọb zụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha nʼaka ụmụ Hamọ nna Shekem. Ala a ghọrọ nʼihe nketa ụmụ Josef.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.