Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọkpụkpụ Josef ndị Izrel chịtara mgbe ha si nʼala Ijipt pụta, ka ha liri na Shekem, nʼime ala ahụ Jekọb zụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha nʼaka ụmụ Hamọ nna Shekem. Ala a ghọrọ nʼihe nketa ụmụ Josef.

Joshua 24:32 in English

Joshua 24:32 · Berean Standard Bible

And the bones of Joseph, which the Israelites had brought up out of Egypt, were buried at Shechem in the plot of land that Jacob had purchased from the sons of Hamor, Shechem’s father, for a hundred pieces of silver.* So it became an inheritance for Joseph’s descendants.

Context

30E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, na Timnat Sera,* nʼime ala ugwu ugwu Ifrem, nʼakụkụ ugwu dị nʼala Gaash. 31Ndị Izrel fere Onyenwe anyị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, ndị maakwara ihe niile nke Onyenwe anyị rụụrụ ndị Izrel. 32Ọkpụkpụ Josef ndị Izrel chịtara mgbe ha si nʼala Ijipt pụta, ka ha liri na Shekem, nʼime ala ahụ Jekọb zụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha nʼaka ụmụ Hamọ nna Shekem. Ala a ghọrọ nʼihe nketa ụmụ Josef. 33Elieza nwa Erọn, nwụkwara. E liri ya nʼala ugwu ugwu ndị Ifrem, na Gibea, obodo e nyere nwa ya bụ Finehaz. 24:13 Dit 6:10-11 24:30 Jos 19:50; Nkp 2:9

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.