Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ dịghị anya, mgbe ihe ndị a gasịrị, Joshua nwa Nun, odibo Onyenwe anyị nwụrụ, mgbe ọ gbara narị afọ na iri.

Joshua 24:29 in English

Joshua 24:29 · Berean Standard Bible

Some time later, Joshua son of Nun, the servant of the LORD, died at the age of 110.

Context

27Joshua sịrị ndị ahụ niile, “Lee, nkume a ga-abụ ihe ama megide anyị. Nʼihi na ọ nụla okwu niile nke Onyenwe anyị gwara anyị. Ọ ga-abụkwa ihe ama megide unu, ma ọ bụrụ na unu mee ihe mmekpu megide Chineke unu.” 28Emesịa, Joshua zilara onye ọbụla, ka ha laa nʼihe nketa nke aka ha. 29Ọ dịghị anya, mgbe ihe ndị a gasịrị, Joshua nwa Nun, odibo Onyenwe anyị nwụrụ, mgbe ọ gbara narị afọ na iri. 30E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, na Timnat Sera,* nʼime ala ugwu ugwu Ifrem, nʼakụkụ ugwu dị nʼala Gaash. 31Ndị Izrel fere Onyenwe anyị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, ndị maakwara ihe niile nke Onyenwe anyị rụụrụ ndị Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.