Joshua 21:17
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebo Benjamin nyere ha obodo anọ ndị a, Gibiọn, Geba,
Joshua 21:17 in English
Joshua 21:17 · Berean Standard Bible
And from the tribe of Benjamin they gave them Gibeon, Geba,
Context
15Họlọn, Debịa, 16Ain, Juta na Bet-Shemesh. E nyekwara ha ala niile gbara obodo ndị a gburugburu ka ọ bụrụ ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri. Ya mere, ọ bụ obodo itoolu ka e si nʼala ebo Juda na Simiọn kenye ha. 17Ebo Benjamin nyere ha obodo anọ ndị a,
Gibiọn, Geba, 18Anatot, Almon na ala dị ya gburugburu ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri, bụ obodo anọ. 19Ya mere, obodo niile e nyere ndị nchụaja, ụmụ ụmụ Erọn dị iri na atọ, tinyere ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.