Juel 2:16
Joel 2:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chịkọtaa onye ọbụla, doo nzukọ ahụ nsọ, ma ndị okenye, ma ụmụntakịrị, ma ụmụ na-aṅụ ara. Kpọpụta nwoke lụrụ nwunye ọhụrụ site nʼụlọ ya, ya na nwaagbọghọ lụrụ dị ọhụrụ site nʼebe nzuzo ya.
Joel 2:16 in English
Joel 2:16 · Berean Standard Bible
Gather the people, sanctify the congregation, assemble the aged, gather the children, even those nursing at the breast. Let the bridegroom leave his room, and the bride her chamber.
Context
14Onye maara? Ma eleghị anya ọ ga-alọghachite azụ tụgharịa obi ya,
hapụrụ anyị ngọzị ya,
kwe ka eweta onyinye mkpụrụ ubi na onyinye ihe ọṅụṅụ
maka Onyenwe anyị bụ, Chineke unu. 15Fụọ opi ike nʼime Zayọn.
Kpọsaa obubu ọnụ dị nsọ.
Kpọkọta nzukọ dị nsọ. 16Chịkọtaa onye ọbụla,
doo nzukọ ahụ nsọ,
ma ndị okenye,
ma ụmụntakịrị,
ma ụmụ na-aṅụ ara.
Kpọpụta nwoke lụrụ nwunye ọhụrụ site nʼụlọ ya,
ya na nwaagbọghọ lụrụ dị ọhụrụ site nʼebe nzuzo ya. 17Ka ndị nchụaja, bụ ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi,
nọọ nʼetiti ebe ịchụ aja, na mpụta ọnụ ụlọ kwaa akwa.
Ha kpeekwa ekpere sị, “Zọpụta ndị gị, Onyenwe anyị.
Ekwela ka ihe nketa gị bụrụ ihe ịta ụta,
nʼetiti mba dị iche iche.
Ekwela ka ha sị,
‘Olee ebe Chineke ha nọ?’ ” 18Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kworo ekworo nʼihi ala ya,
nwee ọmịiko nʼebe ndị ya nọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.