Juel 2:14
Joel 2:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye maara? Ma eleghị anya ọ ga-alọghachite azụ tụgharịa obi ya, hapụrụ anyị ngọzị ya, kwe ka eweta onyinye mkpụrụ ubi na onyinye ihe ọṅụṅụ maka Onyenwe anyị bụ, Chineke unu.
Joel 2:14 in English
Joel 2:14 · Berean Standard Bible
Who knows? He may turn and relent and leave a blessing behind Him— grain and drink offerings for the LORD your God.
Context
12“Ọ bụladị ugbu a,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,
“Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m.
Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m.” 13Dọwakwaanụ obi unu,
ọ bụghị uwe unu.
Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu,
nʼihi na ọ bụ onye na-eme amara, na onye obi ebere.
Ọ bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ. O jupụtara nʼịhụnanya.
Ọ naghị eme ọsịịsọ nʼinye ntaramahụhụ. 14Onye maara? Ma eleghị anya ọ ga-alọghachite azụ tụgharịa obi ya,
hapụrụ anyị ngọzị ya,
kwe ka eweta onyinye mkpụrụ ubi na onyinye ihe ọṅụṅụ
maka Onyenwe anyị bụ, Chineke unu. 15Fụọ opi ike nʼime Zayọn.
Kpọsaa obubu ọnụ dị nsọ.
Kpọkọta nzukọ dị nsọ. 16Chịkọtaa onye ọbụla,
doo nzukọ ahụ nsọ,
ma ndị okenye,
ma ụmụntakịrị,
ma ụmụ na-aṅụ ara.
Kpọpụta nwoke lụrụ nwunye ọhụrụ site nʼụlọ ya,
ya na nwaagbọghọ lụrụ dị ọhụrụ site nʼebe nzuzo ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.